Psalms 84

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit.

Agụụ nke ụlọnsọ Chineke

1Lee ka ebe obibi gị sị maa mma,
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!
2Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba,
ịbata nʼogige Onyenwe anyị;
mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu
na-achọ Chineke dị ndụ.
3Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi;
eleke achọtakwarala onwe ya akwụ,
ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya,
nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị,
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.
4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ;
ha na-eto gị mgbe niile. Sela

5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị,
ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.
6Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe,
ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta;
mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.
Na-ewere ọdọ mmiri kpuchie ya

7Ike ha na-abawanye abawanye,
tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.

8O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m.
Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.
9Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke,
jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.

10Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị,
karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ;
ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m,
karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.
11 Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta;
Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ;
ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla
site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.

12O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.
Copyright information for IboBIU